OZI NWEBISIINKA
ỌKWA NWEBIISINKA NA IKIKE NWERE OKE
Ihe niile ị na-ahụ ma na-anụ na weebụsaịtị a ("Ọdịnaya"), gụnyere, dịka ịmaatụ, ederede niile, akwụkwọ ndekọ, foto, ihe atụ, eserese, nke esere, ihe ngere, ihe nkiri na ihe ngere-nkiri, Dị n'okpuru iwu United States ma ọdabara iwu nchekwa ọrụ nka mba ụwa na ndokwa nkwekọrịta. Iwu nchekwa ọrụnka mmadụ dị na Ọdịnaya bụ nke Agios ma ọ bụ ndị otu ọzọ nwere ikikere ihe ha nye Agios. Ọdịnaya niile nke weebụsaịtị a bụ e deere n’okpuru iwu nchekwa orụnka dị ka mkpokọta ọrụ n'okpuru iwu United States na ọdabara mba nwebisiinka iwu na nkwekọrịta. Agios nwe ọrụ nka iwu chekwara maọbụ nwebisiinka na nhọrọ, nhazi, ndokwa na nkwalite nke Ọdịnaya. Ị nwere ike ibudata, chekwaa, bipụta ma detuo akụkụ ndị a họrọ nke Ọdịnaya nke weebụsaịtị a, ma ọ bụrụ na gị:
- Jiri naanị Ọdịnaya ị na-ebudata maka ojiji nkeonwe gị, nke na-enweghị nkwekọrịta ma ọ bụ iji kwalite mmekọrịta azụmahịa gị na Agios
- E bipụtala ma ọ bụ kụ̀nye ozī akụkụ ọ bụla nke Ọdịnaya na saịtị Ịntanetị ọ bụla ọzọ n'enwetaghị nkwenye ederede mbụ nke Agios
- Agbanwela ma ọ bụ megharịa Ọdịnaya ahụ n'ụzọ ọ bụla ma ọ bụ hichapụ ma ọ bụ gbanwee ikike nwebisiinka ọ bụla ma ọ bụ ọkwa ọbụla maọbụ ọkwa nke nzuzo
E nweghị ikike, aha otutu ma ọ bụ mmasị na ọdịnaya e budatara na-agafere gị mgbe ị na-ebudata Ọdịnaya site na weebụsaịtị a. Agios nwere ikike ọgụgụ isi niile na Ọdịnaya ọbụla ị na-ebudata na weebụsaịtị a. E wezuga dị ka e kwuru n'elu, ị nweghị ike idegharị, budata, bipụta, kwusaa, gosipụta, rụọ ọrụ, kesaa, nyefee, ziga, tụgharịa, gbanwee, gbakwunye, melite, chịkọta, dekọta mkpirisi ma ọ bụ n'ụzọ ọ bụla ọzọ gbanwee ma ọ bụ chigharịa akụkụ niile ma ọ bụ akụkụ ọ bụla nke Ọdịnaya ahụ n'ebughị ụzọ nweta ikike ederede site na Agios.
Ọ bụrụ na ị na-eche na ọdịnaya ọ bụla dị na weebụsaịtị a na-emebi ikike nwebisiinka, ihe-ejirimaraonye, ikike ire ma ọ bụ ikike ọzọ nke otu ọzọ, biko zigara onye ọrụ ndi Agios họpụtara mailu na info@agios.com.
ỌKWA ỤGHALAAHỊA
ihe-ejirimaraonye niile, akara ọrụ na akara ngosi e gosipụtara na weebụsaịtị a ("ihe-ejirimaraonye") ihe e debanyere m’akwụkwọ na ihe edebanyeghi n’akwụkwọ aha nke ndi Agios ma ọ bụ ndị otu ọzọ nyere ndi Agios ikikere nwebisiinka ha. E wezuga dị ka e kwuru n'ụzọ doro anya na iwu na ọnọdụ ndị a, ị nweghị ike ịmụpụta, gosipụta ma ọ bụ jiri Tredimaakị ọ bụla na-ebughị ụzọ nweta ikike ederede Agios.
ECHICHE NDỊ A NA-ACHỌGHỊ
Agios na-anabata okwuntụkwàsa gị na nzaghachi gị gbasara weebụsaịtị a. A ga-ewere ozi niile na ihe niile, gụnyere okwuntụkwàsa, echiche, ajụjụ, atụmatụ, na ihe ndị yiri ya, nyefere Agios site na weebụsaịtị a ma a ga ahu ya ka ihe ENWEGHỊ NZUZO na ihe ENWEGHỊ IKIKE. N'ihi nke a, anyị na-arịọ ka ị ghara izitere anyị ozi ọbụla ma ọ bụ ihe ọbụla ị na-achọghị ikenye anyị, gụnyere ozi nzuzo ọbụla ma ọ bụ ozi ọbụla maọbụ ihe ihe e chepụtara n’ụche echiche ngwaahịa, koodu kọmputa ma ọ bụ ihe osise mbụ. Site n'ịnyefe ozi ma ọ bụ ihe nye ndị Agios site na webụsaịtị a, ị na-ekenye Agios, n'efu, ikike zuru ụwa ọnụ, aha na mmasị na ikike nwebisiinka na ikike ihe ndị ọzọ sitere n’ọgụgụ isi ndị ọzọ dị na ozi ma ọ bụ ihe ị nyefere. Agios ga-enwe ikike iji ozi ma ọ bụ ihe ọ bụla ị nyefere site na webụsaịtị a maka ebumnuche ọ bụla dabere na amụma nzuzo anyị, n'enweghị mmachi ya na na-akwụghị gị ụgwọ n'ụzọ ọbụla.
IWU NZUZO WEEBỤSAỊTỊ
Pịa ebe a iji lee Iwu Nzuzo weebụsaịtị Agios metụtara iji data nkeonwe a nakọtara site na weebụsaịtị a, nke e tinyere site na nrụtụaka dịka akụkụ nke Usoro na Ọnọdụ ndị a.
ỌWARA ỤZỌ MBANYE NKE WEEBỤSAỊTỊ NDỊ ỌZỌ
Saịtị a nwere ike ịnwe ọkanjịkọ na weebụsaịtị nke ndị Agios anaghị eji arụ ọrụ. Ọkanjịkọ ndị a bụ ihe e nyere maka nrụtụaka gị na ịdị mma naanị, ma o gosighị nkwado ọbụla nke ihe onwunwe ma ọ bụ ọrụ e nyere na weebụsaịtị ndị ọzọ a ma ọ bụ mkpakọrịta ọbụla na ndị ọrụ ha. Agios anaghị enyocha ma ọ bụ chịkwaa weebụsaịtị ndị a ma ọ bụghịkwa ya na-ahu maka ọdịnaya ha. Agios kwupụtara ngọpụrụonwe doro anya banyere ọrụ ọbụla maka ọdịnaya nke weebụsaịtị ọbụla nke ndị ọzọ jikọtara ya na weebụsaịtị anyị ma ọ bụ ngwaahịa ma ọ bụ ọrụ nke ndị ọzọ dị etú ahụ. Ebe nrụọrụ weebụsaịtị ndị ọzọ a (ya na weebụsaịtị ndị ha jikọtara) nwere ike ịnwe ozi ezighi ezi n’ezughị ezu, nke ezughi oke ma ọ bụ dị ochie. Agios anaghị eme ihe nnọchiteanya ọbụla gbasaara ọdịnaya ma ọ bụ izu-ezu nke ihe dị na udị weebụsaịtị ndị dị otú ahụ nke na-abụghị Agios nwe ma ọ bụ ngwaahịa ma ọ bụ ọrụ nke ndị ọzọ ọbụla ji weebụsaịtị dị etú ahụ arụ ọrụ. Ị na-enweta ma jiri weebụsaịtị ndị a (na weebụsaịtị ndị ha jikọtara) naanị n'ihe ize ndụ nke onwe gị.
Ọ BỤGHỊ IHE NNỌCHITEANYA NDỤMỌDỤ AHỤIKE
Ozi e nyere na weebụsaịtị a abụghị ihe e bu n'obi ma ọ bụ tụọ aro ka ọ bụrụ ihe nnọchiteanya ndụmọdụ ahụike nke ọkachamara. Mgbe niile, na-achọ ndụmọdụ nke dọkịta gị ma ọ bụ onye ọzọ ruru eru ịnye ndụmọdụ gbasara ọnọdụ ahụike ma ọ bụ ọgwụgwọ ọbụla. Ọ dịghị ihe dị na weebụsaịtị a e bunobi ka ọbụrụ maka ime nchọpụta ọnọdụ ahụike ma ọ bụ ọgwụgwọ.
NGỌPỤRỤONWE AKWỤKWỌ IKIKE
A na-enye ebe nrụọrụ weebụsaịtị a na ntọala "KA Ọ DỊ" "DỊ KA E NWERE,", na-enweghị akwụkwọ ikike nke ụdị ọbụla. Ruo n'ókè zuru oke o kwere omume n'ịgbaso iwu ọdabara, Agios na-agọpụrụonwe ha n’ihe gbasara akwụkwọ ikike niile, egosipụtara, mee mpụtara ma ọ bụ kwekọrọ n’iwu, nke gụnyere, ma ọ bụghị nanị, akwụkwọ ikike nke ịzụ ahịa, ahụike maka otu nzube, ya na ịghara ịda iwu nke ikike ndị otu ọzọ na akwụkwọ ikike ndị e gosipụtara nke na-esite na usoro nke ịzụ ahịa ma ọ bụ usoro arụmọrụ. N’enweghị mmachi okwu ahụ, Agios anaghị anọchite anya ma ọ bụ mee nkwado ikike na weebụsaịtị a ga-adị n'oge ọbụla ma ọ bụ ọnọdụ ọbụla ma ọ bụ na ọrụ ya agaghị akwụsị ma ọ bụ na ihe niile dị na ya ziri ezi. Agios anaghị anọchite anya ma ọ bụ nye ikike na ọdịnaya nke saịtị a enweghị nje vaịrọs, ikpuru ma ọ bụ koodu ndị ọzọ nwere ike igosipụta mmetọ ma ọ bụ mebie ihe. Ọ bụrụ na ojiji i jiri ihe dị na weebụsaịtị ahụ mee ihe, ma ọ bụ ndịnà ya butere mkpa ịrụzi ngwaọrụ ma ọ bụ ndochi akụrụngwa ma ọ bụ data, ọ bụghị ọrụ ndị Agios ịkwụ ụgwọ ndị ahụ. Ndị ji ya eme ihe ka ọ dịịrị ichekwaba onwe ha site n’ịwụnye, imelite na ime ka ihe mgbochi nje na-arụ ọrụ n’igweọrụ ha. Ozi e bipụtara na weebụsaịtị a nwere ike bụrụ na o zughị ezu ma ọ bụ na o meela ochie ma nwee ike inwe ihe ezughi oke ma ọ bụ njehie mbipụta akwụkwọ. Agios anaghị enye akwụkwọ ikike ma ọ bụ mee ihe nnọchiteanya ọbụla gbasaara etu e si eji ya eme ihe, ma o ziri ezi ka o zighi ezi, ịdaba n’ihe a chọrọ, ma ọ̀ ka bụ eziokwu, ma a ga-enwe ike ịtụkwasị ya obi ma ọ bụ izu ezu, ma ọ bụ nsonaazụ nke iji, ma ọ bụ n'ụzọ ọzọ na-akwanyere weebụsaịtị a ùgwù ma ọ bụ ozi ọ bụla, ndịnà, ọrụ, ngwanrọ, ederede, eserese na njikọ dị na ya ma ọ bụ mee nnweta site na weebụsaịtị a. N'ihi na ụfọdụ ikike ọchịchị anaghị enye ohere ka e wepu akwụkwọ ikike ụfọdụ, mwepu ndị a nwere ike ọ gaghị emetụta gị. Agios ekwughị na ihe ndị ahụ kwesịrị ekwesị ma ọ bụ na e nwere ike ibudata ya ebe abụghị United States. Ị nweta edemede ụfọdụ nwere ike ọ gaghị abụ iwu site n'aka ụfọdụ ndị ma ọ bụ na mba ụfọdụ. Ọ bụrụ na ị nweta weebụsaịtị ahu na mpụga United States, ị na-eme nke a n'ihe ize ndụ nke gị ma bụrụ onye ga-ahụ maka mgbaso iwu nke ikike ọchịchị gị.
EBENJEDEBE NKE IBUFERE ONYE ỌZỌ IBU
I ji weebụsaịtị eme ihe n’ọnọdụ ize ndụ naanị gị. E nweghi ọnọdụ ọ bụla, nke Agios ma ọ bụ onye ọ bụla n'ime ndị nduzi ya, ndị ọrụ, ndị e were n’ọrụ ya, ma ọ bụ ndị nnọchiteanya ga-akwụ ụgwọ maka ihe ọbụla furu efu, n’uzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè ma ọ bụ mmebi nke na-esite na ma ọ bụ n'ihe metụtara n’ojiji I ji webụsaịtị a eme ihe, ma ọ bụ enweghị ike iji weebụsaịtị a ma ọ bụ ịdabere na ozi ọbụla e nyere na weebụsaịtị a, ọbụlagodi ma a gwara Agios banyere ohere na ihe nwere ike ifu ma ọ bụ mmebi dị etú ahụ. Nke a bụ njedebe zuru oke nke ibufere ndị ọzọ ibu nke metụtara ihe niile na-efu efu, na ihemmebi nke ụdị ọbụla, ma ọ bụ n’uzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, n'ozuzu, nke pụrụ iche, di mberede, nke nsonaazụ, ihe nlereanya ma ọ bụ n'ụzọ ọzọ, gụnyere n’enweghị mmachi, data ifu efu, ego ma ọ bụ uru. Ebenjedeba nke ibu onye ọzọ na-emetụta ihe gbasara ebubo ibufere onye ọzọ ibu ọ dabeere na nkwekọrịta, nleghara anya, mmebi iwu, iwu ibufere onye ọzọ ibu siri ike ma ọ bụ ihe ndabere ọbụla ọzọ, ma ọbụlagodi na e nyere onye nnọchiteanya ikike nke Agios ma ọ bụ na ọ kwesịrị ịma banyere ohere nke mmebi dị etú ahụ. Ọ bụrụ na a chọpụtara na akụkụ ọ bụla nke ebenjedebe nke ibufere oye ọzọ ibue onwe abaghị uru ma ọ bụ na a pụghị ịmanye ya n'ihi ihe ọ bụla, mgbe ahụ, ụgwọ nchịkọta nke Agios n'okpuru ọnọdụ ndị dị etú ahụ maka ụgwọ ndị ọzọ gaara ejedebe agaghị agafe otu narị dollar ($100.00).
MKPUCHI N’OGE NSOGBU
Ị kwenyere ịgbachitere, kpuchie, ma jide Agios n’emerụghị ahụ, ma ndị ọrụ ya, ndị nchikwa ya, ndị ọrụ na ndị nnọchitean ya, wee kpuchie ha na mmegide nkwupụta ọbụla, omume ma ọ bụ ihe a chọrọ, gụnyere n’enweghị mmachi, ụgwọ iwu na akaụntụ, nke sitere n’ojiji i ji ihe dị icheiche eme ihe, (gụnyere ngwanrọ) ma ọ bụ mmebi iwu gị nke usoro nkwekọrịta a. Agios ga-enye gị ọkwa ngwa ngwa nke nkwupụta ọbụla dị etú ahụ, okwu ikpe ma ọ bụ ịga n'ihu nke ọ na-enweta ọkwa ya nke ga-enyere gị aka, n’ego gị, n'ịgbachitere nkwupụta ọbụla dị etú ahụ, okwu ikpe ma ọ bụ ikpe na-aga n'ihu n’ụlọikpe.
IWU NCHỊKWA NA IKIKE ỌCHỊCHỊ
Agios na-achịkwa weebụsaịtị a ma na-arụ ọrụ site n’ụlọ ọrụ ya dị n'ime Commonwealth nke Massachusetts na United States. Nkwupụta ọbụla metụtara Iwu na Ọnọdụ ndị a na/ma ọ bụ ojiji i ji weebụsaịtị eme ihe ga-eso nchịkwa iwu nke Commonwealth nke Massachusetts, n’eleghị anya n’ihe banyere esemokwu nke ndokwa iwu ya. Site n’iji weebụsaịtị a eme ihe, i kwenyere na ikike nkeonwe n’ime ụlọ ikpe ndị ọchịchị etiti na steeti nke Massachusetts maka ihe ọbụla na-esite na ma ọ bụ metụtara weebụsaịtị a, iwu na ọnọdụ ndị a ma ọ bụ ojiji i ji weebụsaịtị a eme ihe. Ụlọikpe ndị ọchịchị etiti na steeti nke Massachusetts ga-enwe ikike ọchịchị pụrụ iche maka omume niile dị etú ahụ.
NKEWAPỤ NA MGBAHAPỤ
Ọ bụrụ na okwu ọbụla nke Iwu na Ọnọdụ ndị a enweghị isi ma ọ bụ enweghị mmanye site n’ụlọ ikpe ọbụla nke ikike ruru eru, usoroiwu ndị ọzọ nke Iwu na Ọnọdụ ndị a ga-adịgide n’ike na mmetụta zuru oke. Okwu ọbụla nke Iwu na Ọnọdụ ndị a nke e were dịka ihe n’enweghị isi ma ọ bụ nke a na-apụghị ịmanye akụkụ ya ụfọdụ amanye ga-anọgide n’ike zuru oke na mmetụta ruru n'ókè a nke a na-ejideghị ya dịka ihe enweghị isi ma ọ bụ nke a na-apụghị itinye n’ọlụ. Enweghị mgbahapụ nke oge ọbụla nke Nkwekọrịta a aga-ewere dị ka nkwụsị dị n’ihu ma ọ bụ na-aga n'ihu nke okwu dị etú ahụ ma ọ bụ okwu ọbụla ọzọ.
NKWEKỌRỊTA DUM
Nkwekọrịta na Amụma Nzuzo a bụ mejuputara nkwekọrịta niile dị n'etiti gị na Agios banyere ịnweta na/ma ọ bụ ojiji nke e ji weebụsaịtị a eme ihe na Ọdịnaya ma a gaghị agbanwe ya beluso na Agios emere ya dị ka e nyere n'ime ebe a ma ọ bụ site n’akwụkwọ e dere ede nke ndị otu abụọ ahụ bịanyere aka na ya. Agios nwere ike itinye ikike ya na ọrụ ya n'okpuru Nkwekọrịta a na Amụma Nzuzo nye otu ọbụla n'oge ọbụla n’enyeghị ọkwa ma ọ bụ nweta nkwenye gị.