USORO E SI ETINYE YA N’ỌLỤ
IWU NDUZI NA ỌNỌDỤ NA-ACHỊKỌTA IJI WEEBỤSAỊTỊ AGIOS MEE IHE
OKWU MMALITE
Nnọọ na weebụsaịtị nwale ọgwụ nke Agios RISE UP ELU (“weebụsaịtị”). Agios kepụtara ma debe weebụsaịtị a iji nye ozi ma soro ndị dọkịta, ndị ọrịa, ndị na-etinye ego na ndị ọzọ nwere mmasị n’ịmatakwu banyere Agios na ngwaahịa na ojijeozi ọ na-eweta wee na-akparịta uka. Ị nwere ike iji weebụsaịtị a wee na-eme ihe, ma ọ bụrụhaala na ị na-agbaso iwu na ọnọdụ ndị a. Na mgbakwunye ihe n’iwu na ọnọdụ ndị a, ị ga-agụkwa ma mara okwu e keuru maka Iwu Nzuzo anyị, nke na-ekpughe omume Agios gbasara nchịkọta na iji ozi nkeonwe gị, ya na atumatu ndị ọzọ na-achịkwa akụkụ ndị ọzọ nke weebụsaịtị anyị.
GỊNWA ỊNABATA IWU NA ỌNỌDỤ NDỊ A
Biko were nkeji ole na ole iji jiri nlezianya nyochaa usoro na ọnọdụ ndị a. Site n’ịga na ya na iji weebụsaịtị a eme ihe, ị kwenyere ịgbaso ma bụrụ onye iwu na ọnọdụ ndị a ga-ahụ. Ọ bụrụ na ikwenyeghị ịgbaso ma debe usoro na ọnọdụ ndị a, I nweghi ikike ịga na saịtị a, jiri ya mee ihe, ma ọ bụ budata ihe site na weebụsaịtị a.
IWU NA ỌNỌDỤ NDỊ A NWERE IKE ỊGBANWE.
Agios nwere ikike imelite ma ọ bụ gbanwee iwu na ọnọdụ ndị a n'oge ọ bụla n’ebughị ụzọ maa ọkwa maka ya. Gịnwa iji weebụsaịtị a na-eme ihe mgbe e nwere ụdị mgbanye ahụ bụ nkwekọrịta gị ịgbaso ma debe iwu na ọnọdụ dị ka a gbanwere. Maka nke a, anyị na-agba gị ume ka ị nyochaa usoro na ọnọdụ ndị a oge ọ bụla ị na-eji weebụsaịtị a eme ihe.
E degharịrị iwu na ọnọdụ ndị a ikpeazụ na 28 Julaị 2018.